Native Bible

Hosea 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta.

Hosea 4:11 in English

Hosea 4:11 · Berean Standard Bible

Promiscuity, wine, and new wine take away understanding.

Context

9Ọ ga-abụkwa ka ndị nchụaja dị, otu a ka ndị obodo dịkwa. Nʼihi ya, aga m enye ha ntaramahụhụ ma kwụghachi ha ụgwọ nʼihi omume ha niile. 10“Ha ga na-eri ihe ma afọ agaghị eju ha. Ha ga-ebi ndụ akwụna ma ha agaghị amụba, nʼihi na ha ajụla Onyenwe anyị, were onwe ha nyefee 11nʼaka ịgba akwụna, na mmanya ochie na mmanya ọhụrụ, nke na-ewepụ mmụọ nghọta. 12Ndị nke m na-ajụ osisi apịrị apị ase ihe ha ga-eme, na-anata ọsịsa site na mkpara osisi onye ọ na-ajụ ase. Mmụọ nke ịgba akwụna na-eme ka ha kpafuo; ha gbara akwụna ma hapụ Chineke ha. 13Ha na-achụ aja nʼelu ugwu niile, na-esure onyinye nsure ọkụ nʼelu ugwu nta niile, na nʼokpuru osisi ook, osisi pọpla na osisi terebint, ebe ndo ya dị ezi mma. Nʼihi nke a ka ụmụ unu ndị inyom na-agba akwụna, ndị nwunye ụmụ unu na-akwa iko.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.