Hosiya 4:16
Hosea 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Izrel dị isiike dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike. Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara?
Hosea 4:16 in English
Hosea 4:16 · Berean Standard Bible
For Israel is as obstinate as a stubborn heifer. Can the LORD now shepherd them like lambs in an open meadow?
Context
14“Agaghị m ata ụmụ unu ndị inyom ahụhụ,
mgbe ha na-agba akwụna,
maọbụ taa ndị nwunye ụmụ nwoke unu ahụhụ
mgbe ha na-akwa iko,
nʼihi na ndị ikom unu nʼonwe ha na-ejekwuru ndị akwụna,
ha na ndị akwụna ụlọ arụsị na-achụkọkwa aja,
ma ndị a na-enweghị nghọta ga-ala nʼiyi. 15“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel,
ma ka ikpe gharakwa ịma Juda.
“Unu agakwala Gilgal,
unu agakwala ruo Bet-Aven,
unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’ 16Ndị Izrel dị isiike
dịka nwaagbọghọ ehi dị isiike.
Onyenwe anyị ọ ga-esi aṅaa zụọ ha
dịka ụmụ atụrụ nʼebe ịta nri sara mbara? 17Ifrem na arụsị agbaala ndụ
hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya. 18Ọ bụladị mgbe mmanya ha gwụrụ,
ha na-aga nʼihu na-agba akwụna;
ha hụrụ ihere nʼanya nke ukwuu karịa otuto ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.