Abụ Ọma 38
Psalms 38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe,
maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ. 2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ,
aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ. 3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ;
enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m. 4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m
dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi
nʼihi mmehie enweghị uche m. 6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala
ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ. 7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu
ahụ adịghịkwa m. 8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa.
Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi. 9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m;
ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ. 10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m,
ìhè esitekwala nʼanya m pụọ. 11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,
ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya. 12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,
ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;
ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ. 13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,
dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,
onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;
maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.
Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu. 18Ana m ekwupụta mmehie m;
mmehie m na-ewute m. 19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,
ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba. 20Ndị na-eji ihe ọjọọ akwụghachi m ezi ihe,
na-ebo ebubo megide m
nʼagbanyeghị na m na-achọ ime naanị ezi ihe. 21O Onyenwe anyị, ahapụkwala m;
O Chineke m, anọkwala m ebe dị anya. 22Bịa ọsịịsọ inyere m aka
Onyenwe m na Onye nzọpụta m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.