Native Bible

Psalms 38:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m.

Psalms 38:4 in English

Psalms 38:4 · Berean Standard Bible

For my iniquities have overwhelmed me; they are a burden too heavy to bear.

Context

2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ. 3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m. 4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m. 6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.