Native Bible

Psalms 38:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ.

Psalms 38:6 in English

Psalms 38:6 · Berean Standard Bible

I am bent and brought low; all day long I go about mourning.

Context

4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m. 6Abụ m onye a nyidara ma kwatukwaa nʼala ogologo ụbọchị niile, ana m agagharị nʼiru ụjụ. 7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m. 8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.