Native Bible

Psalms 38:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m.

Psalms 38:3 in English

Psalms 38:3 · Berean Standard Bible

There is no soundness in my body because of Your anger; there is no rest in my bones because of my sin.

Context

1Biko, Onyenwe anyị, abarala m mba nʼiwe, maọbụ taa m ahụhụ mgbe iwe gị dị ọkụ. 2Nʼihi na àkụ gị niile amapuola m ahụ, aka gị adakwasịkwala m, dịka ọ bụ ọkpọ. 3Nʼihi oke iwe gị, ọ dịghị izuoke dị nʼime anụ ahụ; enweghịkwa m udo nʼime ọkpụkpụ m niile nʼihi mmehie m. 4Mmetụta ikpe ọmụma m na-adakwasị m dịka ibu arọ nke dị arọ karịa m. 5Ọnya m na-ere ure na-asọ oyi nʼihi mmehie enweghị uche m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.