Native Bible

Psalms 38:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu.

Psalms 38:14 in English

Psalms 38:14 · Berean Standard Bible

I am like a man who cannot hear, whose mouth offers no reply.

Context

12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya, ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m; ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ. 13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 15O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.