Abụ Ọma 38:13
Psalms 38:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya.
Psalms 38:13 in English
Psalms 38:13 · Berean Standard Bible
But like a deaf man, I do not hear; and like a mute man, I do not open my mouth.
Context
11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m,
ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya. 12Ndị na-achọ igbu m na-esiri m ọnya,
ndị ahụ chọrọ imerụ m ahụ na-ekwu maka ihe dakwasịrị m;
ogologo ụbọchị niile ha na-agba izuzu aghụghọ. 13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla,
dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe,
onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.