Native Bible

Psalms 38:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza.

Psalms 38:15 in English

Psalms 38:15 · Berean Standard Bible

I wait for You, O LORD; You will answer, O Lord my God.

Context

13Adị m ka onye ntị chiri, onye na-apụghị ịnụ ihe ọbụla, dịka onye ogbu, onye na-apụghị imeghe ọnụ ya. 14Adịla m dịka onye na-anaghị anụ ihe, onye ọnụ ya apụghị ịsa okwu. 15O Onyenwe anyị, ana m eche gị; o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m; maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.