Abụ Ọma 38:17
Psalms 38:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada. Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu.
Psalms 38:17 in English
Psalms 38:17 · Berean Standard Bible
For I am ready to fall, and my pain is ever with me.
Context
15O Onyenwe anyị, ana m eche gị;
o Onyenwe m Chineke m, ị ga-aza. 16Nʼihi na asịrị m, “Ekwela ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼisi m;
maọbụ bulie onwe ha elu nʼebe m nọ mgbe ụkwụ m na-agbuchapụ.” 17Nʼihi na lee, ana m achọ ịda ada.
Anọkwa m nʼọnọdụ oke mgbu. 18Ana m ekwupụta mmehie m;
mmehie m na-ewute m. 19Ndị iro m, ndị na-eme ihe ike dị ọtụtụ,
ndị na-akpọ m asị, na-enweghị ihe m mere, bara ụba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.