Native Bible

Psalms 38:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ.

Psalms 38:9 in English

Psalms 38:9 · Berean Standard Bible

O Lord, my every desire is before You; my groaning is not hidden from You.

Context

7Azụ na-egbu m mgbu nke ukwuu ahụ adịghịkwa m. 8Ume ọbụla adịghịkwa nʼime. Adị m ka onye e gwepịara egwepịa. Ana m asụ ude nʼihi oke ihe mgbu nke obi. 9O Onyenwe m, ị maara agụụ niile nke na-agụ obi m; ịsụ ude m ezokwaghị ezo nʼebe ị nọ. 10Obi na-alọ m mmiri, ike na-agwụkwa m, ìhè esitekwala nʼanya m pụọ. 11Ndị m hụrụ nʼanya na ndị enyi m na-asọ m oyi nʼihi ọnya m, ndị agbataobi m na-anọ m ebe dị anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.