Abụ Ọma 88
Psalms 88 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, Chineke onye na-azọpụta m,
nʼehihie na abalị ka m na-eti mkpu akwa nʼihu gị. 2Ka ekpere m bịa nʼihu gị.
Chee ntị gị nụrụ akwa m. 3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m,
anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. 4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu.
Adị m dịka onye na-enweghị ike. 5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,
dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,
ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,
ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,
olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya. 7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela 8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.
O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị, 10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?
Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela 11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?
A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi? 12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị?
Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ? 13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku.
Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ. 14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m?
Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị? 15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso;
ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba. 16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m;
ihe egwu gị alaala m nʼiyi. 17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri;
ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile. 18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya;
ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.