Abụ Ọma 88:9
Psalms 88:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
Psalms 88:9 in English
Psalms 88:9 · Berean Standard Bible
My eyes grow dim with grief. I call to You daily, O LORD; I spread out my hands to You.
Context
7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela 8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.
O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị, 10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị?
Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela 11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị?
A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.