Native Bible

Psalms 88:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi?

Psalms 88:11 in English

Psalms 88:11 · Berean Standard Bible

Can Your loving devotion be proclaimed in the grave, Your faithfulness in Abaddon *?

Context

9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị, 10ọ bụ ndị nwụrụ anwụ ka ị na-egosi ọrụ ebube gị? Ndị nwụrụ anwụ, ha na-ebili too gị? Sela 11Ọ bụ nʼime ili ka a na-ekwupụta ịhụnanya gị? A na-ekwupụta ikwesi ntụkwasị obi gị nʼebe ịla nʼiyi? 12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ? 13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.