Abụ Ọma 88:7
Psalms 88:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela
Psalms 88:7 in English
Psalms 88:7 · Berean Standard Bible
Your wrath weighs heavily upon me; all Your waves have submerged me. Selah
Context
5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche,
dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili,
ndị ị nakwaghị echeta ọzọ,
ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi,
olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya. 7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu;
i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela 8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya,
mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ.
Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ.
O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị;
ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.