Native Bible

Psalms 88:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela

Psalms 88:7 in English

Psalms 88:7 · Berean Standard Bible

Your wrath weighs heavily upon me; all Your waves have submerged me. Selah

Context

5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya. 7Oke iwe gị na-anyịgide m nke ukwuu; i jirila ebili mmiri gị niile kpuchigide m. Sela 8Ị napụla m ndị enyi m, ndị m hụrụ nʼanya, mee ka m bụrụ ihe a na-asọ oyi nʼebe ha nọ. Abụ m onye emechibidoro ụzọ; nke nʼenweghị ike ịpụ ezi; 9anya m adịghị ahụkwa ụzọ nʼihi iru ụjụ. O Onyenwe anyị, ụbọchị niile ka m na-akpọku gị; ana m agbasa aka m abụọ nʼihu gị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.