Native Bible

Psalms 88:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile.

Psalms 88:17 in English

Psalms 88:17 · Berean Standard Bible

All day long they engulf me like water; they enclose me on every side.

Context

15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba. 16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi. 17Ha na-agba m gburugburu ụbọchị niile dịka idee mmiri; ha gbara m gburugburu nʼakụkụ niile. 18Ị napụla m ndị enyi m na ndị m hụrụ nʼanya; ọchịchịrị bụ enyi m nọkarịsịrị m nso.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.