Native Bible

Psalms 88:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike.

Psalms 88:4 in English

Psalms 88:4 · Berean Standard Bible

I am counted among those descending to the Pit. I am like a man without strength.

Context

2Ka ekpere m bịa nʼihu gị. Chee ntị gị nụrụ akwa m. 3Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. 4Agụnyela m nʼetiti ndị na-arịda nʼolulu. Adị m dịka onye na-enweghị ike. 5A họpụtara mụ na ndị nwụrụ anwụ iche, dịka ndị e gburu egbu na-edina nʼili, ndị ị nakwaghị echeta ọzọ, ndị e kewapụrụ site na nlekọta gị. 6Ị tụbanyela m nʼime olulu dịkarịrị omimi, olulu nke ọchịchịrị jupụtara nʼime ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.