Abụ Ọma 87
Psalms 87 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Chineke atọọla ntọala ya nʼelu ugwu nsọ ahụ; 2Onyenwe anyị hụrụ ọnụ ụzọ ama Zayọn nʼanya,
karịa ebe obibi niile nke Jekọb. 3Ihe dị iche iche nke dị ebube ka a na-ekwu banyere gị,
O obodo Chineke; Sela 4“Aga m agụnye Rehab na Babilọn,
dịka ndị na-asọpụrụ m,
aga m agụnyekwa ndị Filistia, na ndị Taịa, na ndị Kush,
aga m asị, ‘A mụrụ nke a na Zayọn.’ ” 5Nʼezie, a ga-ekwu okwu banyere Zayọn sị,
“A mụrụ nke a na nke ọzọ nʼime ya,
ya onwe ya, bụ Onye kachasị ihe niile elu, ga-eme ka o guzosie ike.” 6Onyenwe anyị ga-ede nʼime akwụkwọ usoro nke ndị mmadụ:
“A mụrụ onye a na Zayọn.” 7Dịka ha na-eti egwu, ha ga-abụ abụ sị,
“Isi iyi m niile dị na gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.