Abụ Ọma 86
Psalms 86 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Gee m ntị, O Onyenwe anyị, ma zakwa m,
nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa. 2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;
zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi.
Ị bụ Chineke m; 3meere m ebere, O Onyenwe m,
nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. 4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,
ka m na-eweliri mkpụrụobi m. 5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,
i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere. 7Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị,
nʼihi na ị ga-aza m. 8Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m;
ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ. 9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,
fee gị ofufe, O Onyenwe anyị;
ha ga-ebutere aha gị ebube. 10Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;
ọ bụ naanị gị bụ Chineke. 11Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,
ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị;
nye m obi na-adịghị agba abụọ,
ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. 12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;
aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. 13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
i sitela nʼomimi nke dị ala
site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. 14O Chineke, ndị mpako na-emegide m;
otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m,
ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. 15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 16Chee m ihu, mekwaara m amara.
Nye ohu gị ike gị,
zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị
nʼihi na m na-ejere gị ozi. 17Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,
ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme,
nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.