Native Bible

Psalms 86:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m.

Psalms 86:7 in English

Psalms 86:7 · Berean Standard Bible

In the day of my distress I call on You, because You answer me.

Context

5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m, i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m; gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere. 7Nʼụbọchị nsogbu m, aga m akpọku gị, nʼihi na ị ga-aza m. 8Nʼetiti chi niile, i nweghị oyiri, O Onyenwe m; ọ dịghị ọrụ ebube ọbụla a pụrụ ị sị na ọ dị ka nke ị na-arụ. 9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị, fee gị ofufe, O Onyenwe anyị; ha ga-ebutere aha gị ebube.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.