Abụ Ọma 86:4
Psalms 86:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m, ka m na-eweliri mkpụrụobi m.
Psalms 86:4 in English
Psalms 86:4 · Berean Standard Bible
Bring joy to Your servant, for to You, O Lord, I lift up my soul.
Context
2Chebe ndụ m, nʼihi na m na-erubere gị isi;
zọpụta ohu gị onye nke na-atụkwasị gị obi.
Ị bụ Chineke m; 3meere m ebere, O Onyenwe m,
nʼihi na ana m akpọku gị ogologo ụbọchị niile. 4Wetara ohu gị ọṅụ, nʼihi na ọ bụ gị, O Onyenwe m,
ka m na-eweliri mkpụrụobi m. 5Ị bụ onye na-agbaghara ajọ omume na onye dị mma, O Onyenwe m,
i jupụtara nʼịhụnanya nye ndị niile na-akpọku gị. 6O Onyenwe anyị, nụrụ ekpere m;
gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka ebere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.