Abụ Ọma 86:11
Psalms 86:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị.
Psalms 86:11 in English
Psalms 86:11 · Berean Standard Bible
Teach me Your way, O LORD, that I may walk in Your truth. Give me an undivided heart, that I may fear Your name.
Context
9Mba niile i kere ga-abịa nʼihu gị,
fee gị ofufe, O Onyenwe anyị;
ha ga-ebutere aha gị ebube. 10Nʼihi na ị dị ukwuu na-arụkwa ọrụ ebube dị iche iche;
ọ bụ naanị gị bụ Chineke. 11Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị,
ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị;
nye m obi na-adịghị agba abụọ,
ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. 12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;
aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. 13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
i sitela nʼomimi nke dị ala
site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.