Native Bible

Psalms 86:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m.

Psalms 86:13 in English

Psalms 86:13 · Berean Standard Bible

For great is Your loving devotion to me; You have delivered me from the depths of Sheol.

Context

11Kuziere m ụzọ gị, O Onyenwe anyị, ka m dabere nʼikwesị ntụkwasị obi gị; nye m obi na-adịghị agba abụọ, ka m nwee ike tụọ egwu aha gị. 12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m; aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. 13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. 14O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. 15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.