Abụ Ọma 86:14
Psalms 86:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, ndị mpako na-emegide m; otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m, ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla.
Psalms 86:14 in English
Psalms 86:14 · Berean Standard Bible
The arrogant rise against me, O God; a band of ruthless men seeks my life, with no regard for You.
Context
12Aga m eji obi m niile too gị, O Onyenwe anyị, na Chineke m;
aga m ebulikwa aha gị elu ruo mgbe niile ebighị ebi. 13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
i sitela nʼomimi nke dị ala
site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. 14O Chineke, ndị mpako na-emegide m;
otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m,
ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. 15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 16Chee m ihu, mekwaara m amara.
Nye ohu gị ike gị,
zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị
nʼihi na m na-ejere gị ozi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.