Abụ Ọma 86:15
Psalms 86:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara, iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi.
Psalms 86:15 in English
Psalms 86:15 · Berean Standard Bible
But You, O Lord, are a compassionate and gracious God, slow to anger, abounding in loving devotion and faithfulness.
Context
13Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu;
i sitela nʼomimi nke dị ala
site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. 14O Chineke, ndị mpako na-emegide m;
otù ndị mmadụ na-eme ihe ike na-achọ igbu m,
ha bụ ndị na-ejighị gị kpọrọ ihe ọbụla. 15Ma gị, Onyenwe anyị, ị bụ Chineke onye ọmịiko na onye amara,
iwe adịghị ewe gị ngwangwa, i jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi. 16Chee m ihu, mekwaara m amara.
Nye ohu gị ike gị,
zọpụtakwa nwa ohu gị nwanyị
nʼihi na m na-ejere gị ozi. 17Gosi m ihe ịrịbama nke ga-egosipụta ịdị mma gị,
ka ndị iro m hụ ya si otu a bụrụ ndị ihere ga-eme,
nʼihi na gị, O Onyenwe anyị, nyere m aka ma kasịekwa m obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.