Native Bible

Psalms 88:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị?

Psalms 88:14 in English

Psalms 88:14 · Berean Standard Bible

Why, O LORD, do You reject me? Why do You hide Your face from me?

Context

12A na-amata banyere ọrụ ebube gị nʼebe ọchịchịrị dị? Ma ọ bụ ọrụ ezi omume gị, na ịdị mma gị niile nʼala ndị e chezọrọ echezọ? 13Ma Onyenwe anyị m, ọ bụ gị ka m na-akpọku. Ụtụtụ niile ka ekpere m ga na-abịa nʼebe ị nọ. 14O Onyenwe anyị, gịnị mere i jiri jụ m? Gịnị mekwara i jiri zonarị m ihu gị? 15Site na mgbe okorobịa m, abụ m onye a na-esogbu, onye nọkwa ọnwụ nso; ataala m ahụhụ oke ụjọ gị, anọ m nʼọnọdụ ịda mba. 16Oke iwe gị agabigala nʼahụ m; ihe egwu gị alaala m nʼiyi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.