Abụ Ọma 49
Psalms 49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile!
Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa, 2ma ndị dị ala ma ndị dị elu,*
ma onye ọgaranya ma onye ogbenye. 3Aga m ekwu okwu amamihe,
ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta. 4Aga m aṅa ntị nye ilu,
aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m. 5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara,
mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu, 6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha
ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha. 7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ,
maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ, 8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ,
o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,* 9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi,
ma hapụ ịnwụ. 10Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ,
ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa,
si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha. 11Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi,
ebe obibi ha ruo ọgbọ niile
nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha. 12Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ,
dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa. 13Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha,
na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela 14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,
ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,
ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.
Ozu ha ga-erekasị nʼime ili
nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. 15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,*
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela 16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,
mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba, 17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,
ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili. 18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,
ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu, 19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya
ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ. 20Ndị bara ụba nke na-enweghị nghọta
dịka anụ ọhịa nke ga-ala nʼiyi.
49:2 E nwekwara ike gụọ ya otu a, ma ụmụ mmadụ ma ụmụ nwoke.
49:8 Mat 16:26
49:15 Hos 13:4; Mak 16:6-7
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.