Abụ Ọma 49:13
Psalms 49:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha, na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela
Psalms 49:13 in English
Psalms 49:13 · Berean Standard Bible
This is the fate of the self-confident * and their followers who endorse their sayings. Selah
Context
11Ili ha na-aghọ ụlọ ha ruo ebighị ebi,
ebe obibi ha ruo ọgbọ niile
nʼagbanyeghị na ha gụrụ ọtụtụ ala aha ha. 12Ma mmadụ, nʼagbanyeghị akụnụba ya, aghaghị ịnwụ,
dịka anụ ọhịa, ọ ga-anwụkwa. 13Nke a bụ ihe na-adakwasị ndị na-atụkwasị obi nʼonwe ha,
na ndị na-eso ụzọ ha, ndị na-akwado okwu ha. Sela 14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,
ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,
ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.
Ozu ha ga-erekasị nʼime ili
nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. 15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,*
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.