Abụ Ọma 49:16
Psalms 49:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba, mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba,
Psalms 49:16 in English
Psalms 49:16 · Berean Standard Bible
Do not be amazed when a man grows rich, when the splendor of his house increases.
Context
14Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha,
ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ,
ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ.
Ozu ha ga-erekasị nʼime ili
nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. 15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,*
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela 16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,
mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba, 17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,
ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili. 18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,
ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.