Abụ Ọma 49:17
Psalms 49:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ, ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili.
Psalms 49:17 in English
Psalms 49:17 · Berean Standard Bible
For when he dies, he will carry nothing away; his abundance will not follow him down.
Context
15Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili,*
nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. Sela 16Amala jijiji mgbe mmadụ na-aba oke ụba,
mgbe ịdị ebube nke ụlọ ya na-amụba, 17nʼihi na ọ ga-agba aka laa ma ọ nwụọ,
ịdị ebube ya agaghị eso ya banye nʼili. 18Nʼagbanyeghị na ọ gụrụ onwe ya dịka onye a gọziri agọzi mgbe ọ dị ndụ,
ọ bụ ezie na ndị mmadụ na-eto gị mgbe ị na-enwe ọganihu, 19ọ ga-eso ọgbọ ndị nna nna ya
ndị na-agaghị ahụkwa ìhè ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.