Native Bible

Psalms 49:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,*

Psalms 49:8 in English

Psalms 49:8 · Berean Standard Bible

For the redemption of his soul is costly, and never can payment suffice,

Context

6ndị na-atụkwasị obi nʼakụnụba ha ma na-anyakwa isi nʼihi oke ụba ha. 7O nweghị onye pụrụ ịgbapụta ndụ onye ọzọ, maọbụ nye Chineke ụgwọ e ji agbara onye ahụ, 8nʼihi na ụgwọ e ji agbara ndụ dị oke ọnụ, o nweghị ụgwọ a ga-akwụ nke ga-ezu,* 9nke ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ruo ebighị ebi, ma hapụ ịnwụ. 10Nʼihi na mmadụ niile na-ahụ na ndị amamihe na-anwụ, ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche na-anwụkwa, si otu a hapụrụ ndị ọzọ akụnụba ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.