Native Bible

Psalms 49:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta.

Psalms 49:3 in English

Psalms 49:3 · Berean Standard Bible

My mouth will impart wisdom, and the meditation of my heart will bring understanding.

Context

1Nụrụnụ nke a, unu mmadụ niile! Geenụ ntị, unu ndị niile bi nʼụwa, 2ma ndị dị ala ma ndị dị elu,* ma onye ọgaranya ma onye ogbenye. 3Aga m ekwu okwu amamihe, ihe sị nʼobi m ga-enye nghọta. 4Aga m aṅa ntị nye ilu, aga m e ji ụbọ akwara kọwaa ilu m. 5Nʼihi gịnị ka m ga-eji tụọ egwu mgbe ụbọchị ọjọọ bịara, mgbe ndị aghụghọ ọjọọ gbara m gburugburu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.