Abụ Ọma 27
Psalms 27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị bụ ìhè* m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha
ka ha ripịa anụ ahụ m,
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. 3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị,
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.
O Chineke, Onye nzọpụta m,
ahapụkwala m. 10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,
Onyenwe anyị ga-anabata m. 11Zi m ụzọ gị, O Onyenwe anyị;
duo m nʼụzọ kwesiri
nʼihi ndị na-akpagbu m. 12Ararala m nyefee nʼaka ndị kpọrọ m asị nʼihi ọchịchọ ha,
ọtụtụ ndị ama ụgha ebiliela imegide m,
ha na-ekupụ ihe ike dịka ume. 13Olileanya m bụ nke a:
Aga m ahụ ịdị mma Onyenwe anyị
nʼala ndị dị ndụ. 14Chere Onyenwe anyị;
dịrị ike, nwekwaa ume,
ma chere Onyenwe anyị.
27:1 Aịz 60:19-20; Mai 7:8
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.