Abụ Ọma 26
Psalms 26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị, biko kpepụta m,
nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;*
atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi,
na-eleghị anya nʼazụ. 2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m,
nyochaa obi m na echiche m. 3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m.
Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. 4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. 6Ana m asacha aka* m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị. 7Ana m abụkwa abụ ekele,
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. 8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya. 9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie,
ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara, 10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ,
aka nri ha jupụtakwara na ngarị. 11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke;
gbapụta m ma meere m ebere. 12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị;
aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ.
26:1 2Ez 20:2; Ilu 20:7
26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.