Native Bible

Psalms 26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 26
1Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;* atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ. 2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m. 3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. 4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. 6Ana m asacha aka* m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị. 7Ana m abụkwa abụ ekele, jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. 8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya, ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya. 9Ebibikọtala mụ na ndị mmehie, ewezugakọtala ndụ m na nke ndị na-awụfu ọbara, 10ndị aka ha jupụtara nʼatụmatụ ọjọọ, aka nri ha jupụtakwara na ngarị. 11Ma mụ onwe m na-ebi ndụ zuruoke; gbapụta m ma meere m ebere. 12Ụkwụ m na-eguzo nʼala dị larịị; aga m eto Onyenwe anyị nʼetiti ọha mmadụ. 26:1 2Ez 20:2; Ilu 20:7 26:6 Ọ bụrụ na mmadụ asacha maọbụ kwọọ aka ya nʼihu ọha, ọ na-apụta ngọpụ site nʼihe na-ezighị ezi, maọbụ onye dị otu a na-asị, ikpe amaghị m. Abụ 73:13

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.