Native Bible

Psalms 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị.

Psalms 26:3 in English

Psalms 26:3 · Berean Standard Bible

For Your loving devotion is before my eyes, and I have walked in Your truth.

Context

1Onyenwe anyị, biko kpepụta m, nʼihi na ebiela m ndụ zuruoke;* atụkwasịrị m Onyenwe anyị obi, na-eleghị anya nʼazụ. 2Tulee m, O Onyenwe anyị, ma nwakwaa m, nyochaa obi m na echiche m. 3Nʼihi na ejirila m ịhụnanya gị mere ihe nlere anya nye onwe m. Ana m ejegharịkwa nʼime eziokwu gị. 4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla. Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị. Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.