Abụ Ọma 26:6
Psalms 26:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m asacha aka* m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ, na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị.
Psalms 26:6 in English
Psalms 26:6 · Berean Standard Bible
I wash my hands in innocence that I may go about Your altar, O LORD,
Context
4Mụ na ndị na-aghọ aghụghọ adịghị enwe mmekọ ọbụla.
Otu a kwa, nnwekọ ọbụla adịghịkwa nʼetiti mụ na ndị ihu abụọ. 5Akpọrọ m otu ndị na-emebi iwu asị.
Mụ na ndị ajọ omume agaghị anọkọkwa. 6Ana m asacha aka* m abụọ nʼọnọdụ emeghị ihe ọjọọ,
na-eje ozi nʼebe ịchụ aja gị ife gị ofufe, o Onyenwe anyị. 7Ana m abụkwa abụ ekele,
jiri iti mkpu na-ekwusa otuto gị, na ọrụ ebube gị niile. 8O Onyenwe anyị, ahụrụ m ụlọ obibi gị nʼanya,
ụlọ ahụ ebe ebube gị na-adịgide nʼime ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.