Abụ Ọma 27:5
Psalms 27:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu, ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya; ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya; ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume.
Psalms 27:5 in English
Psalms 27:5 · Berean Standard Bible
For in the day of trouble He will hide me in His shelter; He will conceal me under the cover of His tent; He will set me high upon a rock.
Context
3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.