Abụ Ọma 27:6
Psalms 27:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị.
Psalms 27:6 in English
Psalms 27:6 · Berean Standard Bible
Then my head will be held high above my enemies around me. At His tabernacle I will offer sacrifices with shouts of joy; I will sing and make music to the LORD.
Context
4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya. 5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.