Abụ Ọma 27:7
Psalms 27:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m.
Psalms 27:7 in English
Psalms 27:7 · Berean Standard Bible
Hear, O LORD, my voice when I call; be merciful and answer me.
Context
5Nʼihi na nʼụbọchị nsogbu,
ọ ga-echebe m nʼime ebe obibi ya;
ọ ga-ezo m nʼime ụlọ ikwu ya;
ma bulie m elu, debe m nʼelu oke nkume. 6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị,
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.
O Chineke, Onye nzọpụta m,
ahapụkwala m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.