Native Bible

Psalms 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.

Psalms 27:8 in English

Psalms 27:8 · Berean Standard Bible

My heart said, “Seek His face.” Your face, O LORD, I will seek.

Context

6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu karịa ndị iro m gbara m gburugburu; aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya; aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị. Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị, agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe; nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m. O Chineke, Onye nzọpụta m, ahapụkwala m. 10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m, Onyenwe anyị ga-anabata m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.