Abụ Ọma 27:8
Psalms 27:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!” Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ.
Psalms 27:8 in English
Psalms 27:8 · Berean Standard Bible
My heart said, “Seek His face.” Your face, O LORD, I will seek.
Context
6Mgbe ahụ, a ga-eweli isi m elu
karịa ndị iro m gbara m gburugburu;
aga m eji iti mkpu ọṅụ, chụọ aja nʼụlọ ikwu ya;
aga m abụ abụ, kụọ egwu nye Onyenwe anyị. 7Gee ntị mgbe m na-akpọku gị Onyenwe anyị.
Meere m ebere, zaa m. 8Obi m na-ekwu banyere gị, “Chọọ ihu ya!”
Ihu gị, Onyenwe anyị, ka m ga-achọ. 9Ezonarịla m ihu gị,
agbakụtala ohu gị azụ nʼiwe;
nʼihi na ị bụrịị onye inyeaka m.
O Chineke, Onye nzọpụta m,
ahapụkwala m. 10Ọ bụrụrị na nne na nna m ahapụ m,
Onyenwe anyị ga-anabata m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.