Abụ Ọma 27:1
Psalms 27:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị bụ ìhè* m na nzọpụta m, onye ka m ga-atụ egwu ya? Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m, ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu?
Psalms 27:1 in English
Psalms 27:1 · Berean Standard Bible
The LORD is my light and my salvation— whom shall I fear? The LORD is the stronghold of my life— whom shall I dread?
Context
1Onyenwe anyị bụ ìhè* m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha
ka ha ripịa anụ ahụ m,
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. 3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.