Abụ Ọma 27:2
Psalms 27:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha ka ha ripịa anụ ahụ m, ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị, bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa.
Psalms 27:2 in English
Psalms 27:2 · Berean Standard Bible
When the wicked came upon me to devour my flesh, my enemies and foes stumbled and fell.
Context
1Onyenwe anyị bụ ìhè* m na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu ya?
Onyenwe anyị bụ ebe siri ike nke ndụ m,
ọ bụkwa onye ka m ga-atụ egwu? 2Mgbe ndị na-eme ihe ọjọọ busoro m agha
ka ha ripịa anụ ahụ m,
ọ bụ ndị iro m na ndị kpọrọ m asị,
bụ ndị ga-asọ ngọngọ ma dakwaa. 3Ọ bụrụ na usuu ndị agha agbaa m gburugburu,
obi m agaghị atụ ụjọ ọbụla;
ọ bụladị na agha adaa imegide m,
nʼoge ahụ, ka m ga-enwe ntụkwasị obi. 4Naanị otu ihe ka m rịọrọ nʼaka Onyenwe anyị,
nke ahụ bụkwa ihe m na-achọsi ike;
ka m biri nʼụlọ Onyenwe anyị
ụbọchị niile nke ndụ m,
na ka m lekwasị ịma mma Onyenwe anyị,
na ka m chọọ ya nʼime ụlọnsọ ukwuu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.