Abụ Ọma 28
Psalms 28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;
gị bụ Oke nkume m,
agbala m nkịtị.
Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,
aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu. 2Nụrụ arịrịọ m maka ebere
dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,
mgbe m chịlịri aka m abụọ elu
nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,
tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,
ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,
ma ha bu iro nʼime obi ha. 4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha
na omume ha kwesiri;
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa. 5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,
ọ ga-akwada ha nʼala,
ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ. 6Toonu Onyenwe anyị,
nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere. 7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya. 8Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,
ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ. 9Zọpụta ndị gị, gọzikwaa ihe nketa gị;*
buuru ha onye ọzụzụ atụrụ, na-ekukwa ha ruo mgbe ebighị ebi.
28:9 Maọbụ, ndị nke gị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.