Abụ Ọma 28:6
Psalms 28:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere.
Psalms 28:6 in English
Psalms 28:6 · Berean Standard Bible
Blessed be the LORD, for He has heard my cry for mercy.
Context
4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha
na omume ha kwesiri;
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa. 5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,
ọ ga-akwada ha nʼala,
ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ. 6Toonu Onyenwe anyị,
nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere. 7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya. 8Onyenwe anyị bụ ike nke ndị ya,
ebe mgbaba e wusiri ike nke nzọpụta dịịrị onye ya etere mmanụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.