Abụ Ọma 28:5
Psalms 28:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ, ọ ga-akwada ha nʼala, ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.
Psalms 28:5 in English
Psalms 28:5 · Berean Standard Bible
Since they show no regard for the works of the LORD or what His hands have done, He will tear them down and never rebuild them.
Context
3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,
tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,
ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,
ma ha bu iro nʼime obi ha. 4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha
na omume ha kwesiri;
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa. 5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,
ọ ga-akwada ha nʼala,
ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ. 6Toonu Onyenwe anyị,
nʼihi na o gere ntị nʼarịrịọ m rịọrọ ya ka o meere m ebere. 7Onyenwe anyị bụ ike m na ọta m;
ana m atụkwasị ya obi m, si otu a bụrụ onye a na-enyere aka.
Obi m na-awuli elu nʼihi ọṅụ,
aga m ejikwa abụ m na-eto ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.