Abụ Ọma 28:3
Psalms 28:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha.
Psalms 28:3 in English
Psalms 28:3 · Berean Standard Bible
Do not drag me away with the wicked, and with the workers of iniquity, who speak peace to their neighbors while malice is in their hearts.
Context
1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;
gị bụ Oke nkume m,
agbala m nkịtị.
Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,
aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu. 2Nụrụ arịrịọ m maka ebere
dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,
mgbe m chịlịri aka m abụọ elu
nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,
tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,
ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,
ma ha bu iro nʼime obi ha. 4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha
na omume ha kwesiri;
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa. 5Nʼihi na ha adịghị aghọta ọrụ niile nke Onyenwe anyị,
ha adịghịkwa aghọta ihe aka ya abụọ rụrụ,
ọ ga-akwada ha nʼala,
ọ gaghị ewulikwa ha elu ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.