Native Bible

Psalms 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.

Psalms 28:2 in English

Psalms 28:2 · Berean Standard Bible

Hear my cry for mercy when I call to You for help, when I lift up my hands toward Your holy sanctuary.*

Context

1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku; gị bụ Oke nkume m, agbala m nkịtị. Ọ bụrụ na ị jụ ịza m, aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu. 2Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ, tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe, ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo, ma ha bu iro nʼime obi ha. 4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha na omume ha kwesiri; kwụghachi ha maka ihe aka ha mere, ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.