Abụ Ọma 28:2
Psalms 28:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụ arịrịọ m maka ebere dịka m na-akpọku gị maka enyemaka, mgbe m chịlịri aka m abụọ elu nʼEbe gị Kachasị Nsọ.
Psalms 28:2 in English
Psalms 28:2 · Berean Standard Bible
Hear my cry for mercy when I call to You for help, when I lift up my hands toward Your holy sanctuary.*
Context
1Gị Onyenwe anyị ka m na-akpọku;
gị bụ Oke nkume m,
agbala m nkịtị.
Ọ bụrụ na ị jụ ịza m,
aga m eyi otu nʼime ndị ahụ na-arịda nʼolulu. 2Nụrụ arịrịọ m maka ebere
dịka m na-akpọku gị maka enyemaka,
mgbe m chịlịri aka m abụọ elu
nʼEbe gị Kachasị Nsọ. 3Adọkpụrụla m tinyere ndị ajọ mmadụ,
tinyekwara ndị na-eme ajọ ihe,
ndị ji ire ụtọ agwa ndị agbataobi ha okwu udo,
ma ha bu iro nʼime obi ha. 4Kwụghachi ha dịka ọrụ ọjọọ ha
na omume ha kwesiri;
kwụghachi ha maka ihe aka ha mere,
ka ihe ga-adakwasị ha bụrụ ihe ha kwesiri iketa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.