Native Bible

Psalms 29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 29
1Toonu Onyenwe anyị, unu ndị bi nʼeluigwe, nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ nʼihi ebube na ike ya. 2Nyenụ Onyenwe anyị nsọpụrụ kwesiri aha ya; kpọọ isiala nye Onyenwe anyị nʼebube nke ịdị nsọ ya. 3Olu Onyenwe anyị na-ada nʼelu osimiri; olu Chineke dị ebube na-ada ike ike, olu Onyenwe anyị na-ada dịka egbe eluigwe* nʼelu oke osimiri. 4Olu Onyenwe anyị dị ike, olu Onyenwe anyị jupụtakwara nʼebube. 5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida; Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi, ọ na-eme ka Siriọn* wulie elu dịka nwa atụ. 7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ* na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa. Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri; Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. 11Onyenwe anyị na-enye ndị ya ike, ọ ga-ejikwa udo gọzie ndị ya. 29:3 Job 37:4-5; Abụ 18:13 29:6 Nke a bụ aha ndị Fonikisi bi na mpaghara ugwu Hemon na-akpọ ugwu ahụ. Hemon dị nʼoke ala nkwa ahụ nʼebe ugwu. Dit 3:9; Abụ 42:6 29:9 Ime na-eme nne ele

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.