Abụ Ọma 29:7
Psalms 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe mgbe amụma na-egbu.
Psalms 29:7 in English
Psalms 29:7 · Berean Standard Bible
The voice of the LORD strikes with flames of fire.
Context
5Olu Onyenwe anyị na-etiwa osisi ukwu sida;
Onyenwe anyị na-etiwasị osisi ukwu sida nke Lebanọn. 6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn* wulie elu dịka nwa atụ. 7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ*
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.