Abụ Ọma 29:8
Psalms 29:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji; Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji.
Psalms 29:8 in English
Psalms 29:8 · Berean Standard Bible
The voice of the LORD shakes the wilderness; the LORD shakes the Wilderness of Kadesh.
Context
6Ọ na-eme ka Lebanọn wulie elu dịka nwa ehi,
ọ na-eme ka Siriọn* wulie elu dịka nwa atụ. 7Olu Onyenwe anyị na-agba dịka egbe eluigwe
mgbe amụma na-egbu. 8Olu Onyenwe anyị na-eme ka ọzara maa jijiji;
Onyenwe anyị na-eme ka ọzara Kadesh maa jijiji. 9Olu Onyenwe anyị na-eme ka osisi ook gbagọọ*
na-agbuchapụkwa akwụkwọ niile nke oke ọhịa.
Nʼime ụlọnsọ ukwuu ya mmadụ niile na-eti, “Ebube!” 10Onyenwe anyị nọ nʼocheeze ya nʼelu uju mmiri;
Onyenwe anyị na-achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.